12Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eziga ndị ikom ọrụ ha bụ ịwụpụ ihe site nʼite, ha ga-awụpụkwa ya. Ha ga-agbapụ ihe niile dị nʼite ya niile, tụwakwaa ite ya niile.
13Mgbe ahụ, ihere Kemosh ga-eme Moab, dịka ihere si mee Izrel mgbe ha tụkwasịrị Betel obi ha.
14“Unu si aṅaa ekwu sị, ‘Ndị dị ike nʼagha ka anyị bụ; anyị bụkwa dimkpa nʼagha’?
15A ga-ebibi ala Moab, busokwa obodo ya niile agha. Ụmụ okorobịa ya niile ndị ahọrọ ahọ ga-ada nʼogbugbu ahụ.” Otu a ka Eze ahụ kwubiri, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
16“Ọdịda Moab dị nso; oke nhụju anya ya ga-abịakwa ọsịịsọ.