13Mgbe ahụ, ihere Kemosh ga-eme Moab, dịka ihere si mee Izrel mgbe ha tụkwasịrị Betel obi ha.
14“Unu si aṅaa ekwu sị, ‘Ndị dị ike nʼagha ka anyị bụ; anyị bụkwa dimkpa nʼagha’?
15A ga-ebibi ala Moab, busokwa obodo ya niile agha. Ụmụ okorobịa ya niile ndị ahọrọ ahọ ga-ada nʼogbugbu ahụ.” Otu a ka Eze ahụ kwubiri, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
16“Ọdịda Moab dị nso; oke nhụju anya ya ga-abịakwa ọsịịsọ.
17Kasịenụ ya obi, unu ndị niile gbara ya gburugburu, unu ndị niile maara na ọ bụ mba dị ukwuu. Kwupụtanụ sị, ‘Esi aṅa gbajie mkpanaka eze a, nke dị ike, lee ka e si gbajiekwa mkpanaka a nke dị ebube!’