15A ga-ebibi ala Moab, busokwa obodo ya niile agha. Ụmụ okorobịa ya niile ndị ahọrọ ahọ ga-ada nʼogbugbu ahụ.” Otu a ka Eze ahụ kwubiri, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
16“Ọdịda Moab dị nso; oke nhụju anya ya ga-abịakwa ọsịịsọ.
17Kasịenụ ya obi, unu ndị niile gbara ya gburugburu, unu ndị niile maara na ọ bụ mba dị ukwuu. Kwupụtanụ sị, ‘Esi aṅa gbajie mkpanaka eze a, nke dị ike, lee ka e si gbajiekwa mkpanaka a nke dị ebube!’
18“Sitenụ nʼebe nsọpụrụ unu dị elu rịdata, bịa nọdụnụ nʼala kpọrọ nkụ, unu ndị bi nʼobodo bụ Ada Dibọn. Nʼihi na onye ahụ bibiri Moab ga-abịa ibu agha megide unu, ọ ga-alakwa obodo unu niile e wusiri ike nʼiyi.
19Guzonụ nʼakụkụ ụzọ, hụrụ ihe na-eme, unu ndị bi nʼime Aroea. Jụọnụ nwoke unu hụrụ na-agba ọsọ, na nwanyị nke na-ewezuga onwe ya ajụjụ sị ha, ‘Gịnị mere?’