1Nke a dịrị Moab: Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Ahụhụ dịrị Nebo! Nʼihi na a ga-emebi ya. A ga-emekwa ka ihere mee Kiriatem, e, a ga-adọta ya nʼagha. A ga-etipịa Misgab, mee ka ihere mee ya.
2Ọ dịkwaghị ndị ga-eto Moab ọzọ, kama a ga-anọ na Heshbọn pịa ọpịpịa ọdịda ya. Ha ga-asị, ‘Bịanụ ka anyị bibie mba a, ka ọ ghara ịdịkwa.’ Ọ bụladị gị bụ Madmen, ka a ga-eme ka i dere duu. A ga-ejikwa mma agha chụọ gị ọsọ.
3Gee ntị nụrụ akwa na-ada na Horonaim, ọ bụ mkpu akwa oke mbibi na ịla nʼiyi.
4A ga-etikpọ Moab, ụmụntakịrị ya ga-etikwa mkpu akwa.