Jeremaya 48

Aga m eme ka ndị ahụ niile na-achụ aja nʼebe niile dị elu, na ndị ahụ niile na-achụrụ chi ha dị iche iche aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, hapụ ịdịkwa nʼala Moab,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Jeremiah 48:35 (UKJV) Moreover I will cause to cease in Moab, says the LORD, him that offers in the high places, and him that burns incense to his gods.

33Ọṅụ na obi ụtọ ka e wepụrụ site nʼubi vaịnị niile, na nʼala ubi niile nke Moab. E meela ka mmanya vaịnị kwụsị ịgbapụtakwa site nʼebe ịzọcha mmanya. Ọ dịkwaghị onye na-eji mkpu ọṅụ na-azọcha ha, Ọ bụ ezie na a na-anụ olu iti mkpu, ma ọ bụghị olu iti mkpu ọṅụ.

34“A na-anụ ụda iti mkpu akwa ha site nʼobodo Heshbọn ruo Eleale, na Jehaz. A na-anụkwa ya site na Zoa ruo, ọ bụladị obodo ndị dị anya, dịka Horonaim, na Eglat Shelishiya. Nʼihi na mmiri niile nke Nimrim ataala.

35Aga m eme ka ndị ahụ niile na-achụ aja nʼebe niile dị elu, na ndị ahụ niile na-achụrụ chi ha dị iche iche aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, hapụ ịdịkwa nʼala Moab,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

36“Ụda akwa nke na-ada nʼime obi m nʼihi Moab dịka ụda ọja. Ụda akwa nke dịkwa ka ụda ọja na-adakwa nʼime obi m nʼihi ndị Kia Hareset. Akụ niile ha kpakọtara alaala nʼiyi.

37A kpụchapụla agịrị isi niile, kpachakwa afụọnụ ha niile. E bipụkwala aka ha niile. Ọ bụkwa akwa mkpe ka e ji kpuchie ukwu niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.