24Damaskọs aghọọla onye ike gwụrụ. Ọ tụgharịala ịgbapụ ọsọ, ma ọma jijiji ejidela ya. Oke obi ụfụ na ihe mgbu ejidesiela ya aka ike, dịka obi ụfụ na ihe mgbu nke na-ejide nwanyị ime na-eme.
25Gịnị mere na-agbahapụbeghị obodo ahụ a maara aha ya, bụ obodo ahụ nke ihe ya na-atọ obi m ụtọ?
26Nʼezie, ụmụ okorobịa nọ nʼime ya ga-ada nʼokporoụzọ niile, a ga-emekwa ka ndị agha ya niile dere duu nʼụbọchị ahụ.” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
27“Aga m esunye mgbidi Damaskọs ọkụ. Ọkụ ahụ ga-eripịakwa ebe e wusiri ike nke Ben-Hadad.”
28Banyere Keda na alaeze Hazọ, nke Nebukadneza eze Babilọn busoro agha: Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Bilienụ gaa buso Keda agha. Bibiekwanụ ndị ahụ niile bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ.