26Nʼezie, ụmụ okorobịa nọ nʼime ya ga-ada nʼokporoụzọ niile, a ga-emekwa ka ndị agha ya niile dere duu nʼụbọchị ahụ.” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
27“Aga m esunye mgbidi Damaskọs ọkụ. Ọkụ ahụ ga-eripịakwa ebe e wusiri ike nke Ben-Hadad.”
28Banyere Keda na alaeze Hazọ, nke Nebukadneza eze Babilọn busoro agha: Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Bilienụ gaa buso Keda agha. Bibiekwanụ ndị ahụ niile bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ.
29A ga-adọta ụlọ ikwu ha, na igwe ewu na atụrụ ha nʼagha. A ga-ebukọrọkwa ụlọ mgbochi ha niile, ya na ngwongwo na ịnyịnya kamel ha niile. Ndị mmadụ ga-etikwa mkpu sị ha, ‘Oke egwu dị nʼakụkụ niile!’
30“Gbalaganụ ọsịịsọ. Jeenụ nọdụ nʼime ọgba nkume niile miri emi, unu ndị niile bi na Hazọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. Nebukadneza eze Babilọn atụọla atụmatụ megide unu, o chepụtakwala ụzọ ọ ga-esi megide unu.