Jeremaya 49

Damaskọs aghọọla onye ike gwụrụ. Ọ tụgharịala ịgbapụ ọsọ, ma ọma jijiji ejidela ya. Oke obi ụfụ na ihe mgbu ejidesiela ya aka ike, dịka obi ụfụ na ihe mgbu nke na-ejide nwanyị ime na-eme.

Jeremiah 49:24 (UKJV) Damascus is waxed feeble, and turns herself to flee, and fear has seized on her: anguish and sorrows have taken her, as a woman in travail.

22Lee, otu ugo ga-efeli elu, fedatakwa. Ọ ga-agbasapụ nku ya kpuchie ala Bozra niile. Nʼụbọchị ahụ, obi ndị bu dike nʼagha nʼEdọm ga-adị ka obi nwanyị ime na-eme.

23Nke dịrị Damaskọs: “Ụjọ ejula Hamat na Apad obi, nʼihi na ha anụla akụkọ ọjọọ. Ha adaala mba, nọọkwa nʼoke echiche dịka osimiri nke ebili na-amagharị nʼelu ya.

24Damaskọs aghọọla onye ike gwụrụ. Ọ tụgharịala ịgbapụ ọsọ, ma ọma jijiji ejidela ya. Oke obi ụfụ na ihe mgbu ejidesiela ya aka ike, dịka obi ụfụ na ihe mgbu nke na-ejide nwanyị ime na-eme.

25Gịnị mere na-agbahapụbeghị obodo ahụ a maara aha ya, bụ obodo ahụ nke ihe ya na-atọ obi m ụtọ?

26Nʼezie, ụmụ okorobịa nọ nʼime ya ga-ada nʼokporoụzọ niile, a ga-emekwa ka ndị agha ya niile dere duu nʼụbọchị ahụ.” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.