Jeremaya 5

Ndị amụma ndị a niile dịka ikuku, nke okwu nwere isi na-adịghị nʼime ha. Ya mere, ka ihe ahụ niile ha buru nʼamụma bịakwasị ha.”

Jeremiah 5:13 (UKJV) And the prophets shall become wind, and the word is not in them: thus shall it be done unto them.

11Onyenwe anyị ekwuola ya sị, Lee, ụlọ Izrel na ụlọ Juda egosila na ha abụghị ndị e kwesiri ịtụkwasị obi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

12Ha ekwuola okwu ụgha megide Onyenwe anyị. E, ha ekwuola sị, “O nweghị ihe Ọ ga-eme! Ihe ọjọọ ọbụla agaghị adakwasị anyị; mbibi nke ụnwụ na mma agha na-eweta agaghị erute anyị nso.

13Ndị amụma ndị a niile dịka ikuku, nke okwu nwere isi na-adịghị nʼime ha. Ya mere, ka ihe ahụ niile ha buru nʼamụma bịakwasị ha.”

14Nʼihi ihe ndị a niile, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Nʼihi na okwu ndị a esitela nʼọnụ ndị a pụta, aga m eme ka okwu m, nke si gị nʼọnụ na-apụta, ghọọ ọkụ. Aga m emekwa ka ndị a ghọọ nkụ ọkụ ahụ ga-erepịa.

15Unu bụ ndị Izrel,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m eme ka otu mba si nʼebe dị anya bịa megide unu. Ọ bụ mba na-adị site na mgbe ochie, mba dị ike, nke unu na-adịghị anụ asụsụ ha, ndị unu na-adịghị aghọta okwu ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.