9Ma Onyenwe anyị na-ajụ ajụjụ sị, m ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile? M ga-ahapụ ịbọtara mkpụrụobi m ọbọ megide mba dị otu a?”
10“Baanụ nʼime ubi vaịnị ha a gbara ogige kposaa ihe dị nʼime ya, ma unu emebila ya kpamkpam. Gbajisienụ alaka ya nʼihi na o nweghị oge ndị a ji bụrụ ndị nke Onyenwe anyị.
11Onyenwe anyị ekwuola ya sị, Lee, ụlọ Izrel na ụlọ Juda egosila na ha abụghị ndị e kwesiri ịtụkwasị obi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
12Ha ekwuola okwu ụgha megide Onyenwe anyị. E, ha ekwuola sị, “O nweghị ihe Ọ ga-eme! Ihe ọjọọ ọbụla agaghị adakwasị anyị; mbibi nke ụnwụ na mma agha na-eweta agaghị erute anyị nso.
13Ndị amụma ndị a niile dịka ikuku, nke okwu nwere isi na-adịghị nʼime ha. Ya mere, ka ihe ahụ niile ha buru nʼamụma bịakwasị ha.”