7“Nʼihi gịnị ka m ga-eji gbaghara unu? Lee na ụmụ unu ahapụla m, na-agbaso, ma na-eji chi ndị na-abụghị chi na-aṅụ iyi. Ọ bụ m gbooro ha mkpa ha, ma ha nọgidere na-akwa iko. Ha jikwa ụlọ ndị akwụna mere ebe ha na-ezukọ.
8Ha rijuru afọ, gbaa abụba dị ka oke ịnyịnya. Onye ọbụla nʼime ha kwa na-esigharị imi na-akpọku nwunye na-abụghị nke ya.
9Ma Onyenwe anyị na-ajụ ajụjụ sị, m ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile? M ga-ahapụ ịbọtara mkpụrụobi m ọbọ megide mba dị otu a?”
10“Baanụ nʼime ubi vaịnị ha a gbara ogige kposaa ihe dị nʼime ya, ma unu emebila ya kpamkpam. Gbajisienụ alaka ya nʼihi na o nweghị oge ndị a ji bụrụ ndị nke Onyenwe anyị.
11Onyenwe anyị ekwuola ya sị, Lee, ụlọ Izrel na ụlọ Juda egosila na ha abụghị ndị e kwesiri ịtụkwasị obi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.