Jeremaya 5

Ha rijuru afọ, gbaa abụba dị ka oke ịnyịnya. Onye ọbụla nʼime ha kwa na-esigharị imi na-akpọku nwunye na-abụghị nke ya.

Jeremiah 5:8 (UKJV) They were as fed horses in the morning: every one neighed after his neighbour's wife.

6Ya mere, aga m eme ka ọdụm si nʼoke ọhịa bịa lụso ha ọgụ; nkịta ọhịa bi nʼọzara ga-ebibi ha. Otu a kwa, agụ ga-abịa makpuru nso nso obodo ha ịdọkasị onye ọbụla si nʼime obodo ahụ na-apụta. Ihe ndị a ga-emezu nʼihi na nnupu isi ha adịla ukwuu, na nʼihi na ndaghachi azụ ha site na iso ụzọ m adịla ukwuu.

7“Nʼihi gịnị ka m ga-eji gbaghara unu? Lee na ụmụ unu ahapụla m, na-agbaso, ma na-eji chi ndị na-abụghị chi na-aṅụ iyi. Ọ bụ m gbooro ha mkpa ha, ma ha nọgidere na-akwa iko. Ha jikwa ụlọ ndị akwụna mere ebe ha na-ezukọ.

8Ha rijuru afọ, gbaa abụba dị ka oke ịnyịnya. Onye ọbụla nʼime ha kwa na-esigharị imi na-akpọku nwunye na-abụghị nke ya.

9Ma Onyenwe anyị na-ajụ ajụjụ sị, m ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile? M ga-ahapụ ịbọtara mkpụrụobi m ọbọ megide mba dị otu a?”

10“Baanụ nʼime ubi vaịnị ha a gbara ogige kposaa ihe dị nʼime ya, ma unu emebila ya kpamkpam. Gbajisienụ alaka ya nʼihi na o nweghị oge ndị a ji bụrụ ndị nke Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.