10“Baanụ nʼime ubi vaịnị ha a gbara ogige kposaa ihe dị nʼime ya, ma unu emebila ya kpamkpam. Gbajisienụ alaka ya nʼihi na o nweghị oge ndị a ji bụrụ ndị nke Onyenwe anyị.
11Onyenwe anyị ekwuola ya sị, Lee, ụlọ Izrel na ụlọ Juda egosila na ha abụghị ndị e kwesiri ịtụkwasị obi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
12Ha ekwuola okwu ụgha megide Onyenwe anyị. E, ha ekwuola sị, “O nweghị ihe Ọ ga-eme! Ihe ọjọọ ọbụla agaghị adakwasị anyị; mbibi nke ụnwụ na mma agha na-eweta agaghị erute anyị nso.
13Ndị amụma ndị a niile dịka ikuku, nke okwu nwere isi na-adịghị nʼime ha. Ya mere, ka ihe ahụ niile ha buru nʼamụma bịakwasị ha.”
14Nʼihi ihe ndị a niile, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Nʼihi na okwu ndị a esitela nʼọnụ ndị a pụta, aga m eme ka okwu m, nke si gị nʼọnụ na-apụta, ghọọ ọkụ. Aga m emekwa ka ndị a ghọọ nkụ ọkụ ahụ ga-erepịa.