Jeremaya 50

“Izrel dị ka ewu na atụrụ a chụsasịrị achụsasị, nke ọdụm chụsasịrị. Onye bu ụzọ ripịa ya bụ eze Asịrịa. Onye ikpeazụ gwepịara ọkpụkpụ ya bụ Nebukadneza, eze Babilọn.”

Jeremiah 50:17 (UKJV) Israel is a scattered sheep; the lions have driven him away: first the king of Assyria has devoured him; and last this Nebuchadrezzar king of Babylon has broken his bones.

15Kpọọnụ mkpu agha megide ya, site nʼakụkụ niile! Ọ chiliela aka ya elu. Lee, ụlọ elu ya e wusiri ike adaala, a kwatuokwala mgbidi ya niile. Ebe ọ bụ na Onyenwe anyị na-abọrọ onwe ya ọbọ nʼahụ Babilọn, bọọnụ ya ọbọ. Meenụ ya dịka o si mee ndị ọzọ.

16Site na Babilọn wezuga onye na-agha mkpụrụ na onye ji mma owuwe ihe ubi na-ewe ihe ubi. Ka onye ọbụla laghachikwuru ndị nke ya, ka onye ọbụla gbalaakwa nʼala nke aka ya, nʼihi mma agha nke onye na-emegbu emegbu.

17“Izrel dị ka ewu na atụrụ a chụsasịrị achụsasị, nke ọdụm chụsasịrị. Onye bu ụzọ ripịa ya bụ eze Asịrịa. Onye ikpeazụ gwepịara ọkpụkpụ ya bụ Nebukadneza, eze Babilọn.”

18Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Aga m ata eze Babilọn, na ndị ala ya ahụhụ, dịka m si taa eze Asịrịa ahụhụ.

19Ma aga m akpọghachitekwa Izrel nʼebe ịta nri nke ha. Ha ga-atakwa nri na Kamel na Bashan. Ọ bụkwa nʼugwu Ifrem na Gilead ka afọ ga-ejukwa ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.