Jeremaya 50

Ma aga m akpọghachitekwa Izrel nʼebe ịta nri nke ha. Ha ga-atakwa nri na Kamel na Bashan. Ọ bụkwa nʼugwu Ifrem na Gilead ka afọ ga-ejukwa ha.

Jeremiah 50:19 (UKJV) And I will bring Israel again to his habitation, and he shall feed on Carmel and Bashan, and his soul shall be satisfied upon mount Ephraim and Gilead.

17“Izrel dị ka ewu na atụrụ a chụsasịrị achụsasị, nke ọdụm chụsasịrị. Onye bu ụzọ ripịa ya bụ eze Asịrịa. Onye ikpeazụ gwepịara ọkpụkpụ ya bụ Nebukadneza, eze Babilọn.”

18Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Aga m ata eze Babilọn, na ndị ala ya ahụhụ, dịka m si taa eze Asịrịa ahụhụ.

19Ma aga m akpọghachitekwa Izrel nʼebe ịta nri nke ha. Ha ga-atakwa nri na Kamel na Bashan. Ọ bụkwa nʼugwu Ifrem na Gilead ka afọ ga-ejukwa ha.

20Nʼụbọchị ndị ahụ, ma na mgbe ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “a ga-achọ ajọọ omume nke Izrel, ma ọ dịghị nke a ga-achọta. A ga-achọkwa mmehie niile nke Juda, ma o nweghị nke a ga-achọta, nʼihi na aga m agbaghara ndị ahụ m mere ka ha fọdụ mmehie ha.

21“Busonụ ala Merataim agha, busokwanụ ndị bi na Pekod agha. Chụọ ha ọsọ, gbuchapụ ma bibiekwa ha niile kpamkpam.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Mezuonụ ihe niile m nyere unu nʼiwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.