18Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Aga m ata eze Babilọn, na ndị ala ya ahụhụ, dịka m si taa eze Asịrịa ahụhụ.
19Ma aga m akpọghachitekwa Izrel nʼebe ịta nri nke ha. Ha ga-atakwa nri na Kamel na Bashan. Ọ bụkwa nʼugwu Ifrem na Gilead ka afọ ga-ejukwa ha.
20Nʼụbọchị ndị ahụ, ma na mgbe ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “a ga-achọ ajọọ omume nke Izrel, ma ọ dịghị nke a ga-achọta. A ga-achọkwa mmehie niile nke Juda, ma o nweghị nke a ga-achọta, nʼihi na aga m agbaghara ndị ahụ m mere ka ha fọdụ mmehie ha.
21“Busonụ ala Merataim agha, busokwanụ ndị bi na Pekod agha. Chụọ ha ọsọ, gbuchapụ ma bibiekwa ha niile kpamkpam.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Mezuonụ ihe niile m nyere unu nʼiwu.
22A na-anụ ụzụ agha nʼala ahụ, a na-anụ ụzụ oke mbibi.