20Nʼụbọchị ndị ahụ, ma na mgbe ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “a ga-achọ ajọọ omume nke Izrel, ma ọ dịghị nke a ga-achọta. A ga-achọkwa mmehie niile nke Juda, ma o nweghị nke a ga-achọta, nʼihi na aga m agbaghara ndị ahụ m mere ka ha fọdụ mmehie ha.
21“Busonụ ala Merataim agha, busokwanụ ndị bi na Pekod agha. Chụọ ha ọsọ, gbuchapụ ma bibiekwa ha niile kpamkpam.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Mezuonụ ihe niile m nyere unu nʼiwu.
22A na-anụ ụzụ agha nʼala ahụ, a na-anụ ụzụ oke mbibi.
23Lee ka e si gbajie, ma tipịa mkpirisi igwe ahụ na-esupịa ụwa niile. Lee ka Babilọn si tọgbọrọ nʼefu nʼetiti mba niile nke ụwa.
24Esiiri m gị ọnya, gị Babilọn; ị makwara nʼọnya ahụ tupu ị mata na ọnya ahụ dị. A chọtala gị, jidekwa gị, nʼihi na i doola onwe gị ibuso Onyenwe anyị agha.