Jeremaya 51

Unu bụ ndị bi nʼakụkụ ọtụtụ mmiri, ndị nwere akụnụba dị ukwuu, ọgwụgwụ unu abịaruola. Oge ahụ eruola mgbe e ji wezuga unu.

Jeremiah 51:13 (UKJV) O you that dwell upon many waters, abundant in treasures, yours end has come, and the measure of your covetousness.

11“Mụọnụ ọnụ àkụ unu; bulienụ ọta unu! Onyenwe anyị akwaliela ndị eze ndị Midia, nʼihi na nzube ya bụ ịla Babilọn nʼiyi. Onyenwe anyị ga-abọrọ onwe ya ọbọ, ọ ga-abọtara ụlọnsọ ukwu ya ọbọ.

12Bulienụ ọkọlọtọ nʼihi imegide mgbidi Babilọn. Tinyekwanụ ndị agha ọzọ nʼetiti ndị nche, ka ọnụọgụgụ ha hie nne Kwadoonụ ndị ga na-elepụ anya. Kwadoonụ ndị agha ga-ezo onwe ha, nʼihi na Onyenwe anyị ga-eme ka ihe o zubere mezuo, bụ ihe ahụ o kpebiri megide ndị Babilọn.

13Unu bụ ndị bi nʼakụkụ ọtụtụ mmiri, ndị nwere akụnụba dị ukwuu, ọgwụgwụ unu abịaruola. Oge ahụ eruola mgbe e ji wezuga unu.

14Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ji onwe ya ṅụọ iyi, sị, Nʼezie, aga m eme ka ndị mmadụ ọnụọgụgụ ha ga-aha ka igurube jupụta nʼime gị. Ha ga-etikwa mkpu ọṅụ megide gị.

15“O sitere nʼike ya mee ụwa; ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o guzosie ike site nʼamamihe ya, ọ jikwa nghọta ya setịpụ eluigwe niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.