13Unu bụ ndị bi nʼakụkụ ọtụtụ mmiri, ndị nwere akụnụba dị ukwuu, ọgwụgwụ unu abịaruola. Oge ahụ eruola mgbe e ji wezuga unu.
14Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ji onwe ya ṅụọ iyi, sị, Nʼezie, aga m eme ka ndị mmadụ ọnụọgụgụ ha ga-aha ka igurube jupụta nʼime gị. Ha ga-etikwa mkpu ọṅụ megide gị.
15“O sitere nʼike ya mee ụwa; ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o guzosie ike site nʼamamihe ya, ọ jikwa nghọta ya setịpụ eluigwe niile.
16Mgbe o bigbọrọ, mmiri niile nke dị nʼeluigwe na-ebigbọkwa. Ọ na-eme ka igwe ojii site na nsọtụ niile nke ụwa kwụlie. Ọ na-ezipụ amụma mgbe mmiri na-ezo, na-esitekwa nʼụlọ nkwakọba ihe ya na-ewepụta ifufe.
17“Onye ọbụla bụ onye na-enweghị uche nke ihe ọmụma kọrọ. Emeela ka ihere mee onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ọbụla site nʼarụsị ọ kpụrụ. Nʼihi na oyiyi niile ọ na-akpụ bụ aghụghọ; ha enweghị nkuume ọbụla nʼime ha.