1Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee, aga m akpali mmụọ onye mbibi, ka ọ bịa megide Babilọn na ndị bi na Kaldịa.
2Aga m eziga ndị mba ọzọ nʼobodo Babilọn, ka ha gaa fụchaa ya, bibiekwa ala ya. Ha ga-emegide ya nʼakụkụ niile, nʼụbọchị ahụ ihe ọjọọ ga-abịakwasị ya.
3Ekwela ka onye na-agba ụta kwee ụta ya, ekwekwala ka o yikwasị uwe agha ya. Enwekwala ọmịiko nʼebe ụmụ okorobịa ya nọ, kama bibie usuu ndị agha ya kpamkpam.
4Ha ga-ada, bụrụ ndị e gburu egbu nʼime Babilọn, ha ga-abụ ndị e merụrụ oke ahụ nʼokporoụzọ niile.