Jeremaya 51

Ekwela ka onye na-agba ụta kwee ụta ya, ekwekwala ka o yikwasị uwe agha ya. Enwekwala ọmịiko nʼebe ụmụ okorobịa ya nọ, kama bibie usuu ndị agha ya kpamkpam.

Jeremiah 51:3 (UKJV) Against him that bends let the archer bend his bow, and against him that lifts himself up in his brigandine: and spare all of you not her young men; destroy all of you utterly all her host.

1Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee, aga m akpali mmụọ onye mbibi, ka ọ bịa megide Babilọn na ndị bi na Kaldịa.

2Aga m eziga ndị mba ọzọ nʼobodo Babilọn, ka ha gaa fụchaa ya, bibiekwa ala ya. Ha ga-emegide ya nʼakụkụ niile, nʼụbọchị ahụ ihe ọjọọ ga-abịakwasị ya.

3Ekwela ka onye na-agba ụta kwee ụta ya, ekwekwala ka o yikwasị uwe agha ya. Enwekwala ọmịiko nʼebe ụmụ okorobịa ya nọ, kama bibie usuu ndị agha ya kpamkpam.

4Ha ga-ada, bụrụ ndị e gburu egbu nʼime Babilọn, ha ga-abụ ndị e merụrụ oke ahụ nʼokporoụzọ niile.

5Ọ bụ ezie nʼala ha jupụtara nʼikpe ọmụma, nʼihu Onye nsọ nke Izrel, ma Chineke bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile agbakụtabeghị ndị Izrel na Juda azụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.