49“Babilọn ga-ada nʼihi ndị Izrel e gburu, dịka ndị niile e gburu nʼụwa si daa site nʼaka ndị Babilọn.
50Unu ndị siterela nʼihu mma agha gbapụ ọsọ, wezuganụ onwe unu, unu eguzokwala. Chetanụ Onyenwe anyị nʼala ahụ dị anya, na-echetakwa Jerusalem.”
51“Ihere emeela anyị, nʼihi na a kparịala anyị. Ihere ekpuchiekwala ihu anyị, nʼihi na ndị mba ọzọ abatala nʼebe nsọ nke ụlọnsọ Onyenwe anyị.”
52“Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-ata arụsị ya niile ahụhụ. Ndị e merụrụ ahụ ga-asụkwa ude nʼala ahụ niile.
53A sịkwarị na Babilọn a arịgoruo nʼeluigwe, ma a sịkwa na o wusie ebe dị elu nke ike ya mee ka o siwanyekwuo ike karịa, aga m ezite ndị mbibi ga-abịa megide ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.