Jeremaya 51

“Babilọn ga-ada nʼihi ndị Izrel e gburu, dịka ndị niile e gburu nʼụwa si daa site nʼaka ndị Babilọn.

Jeremiah 51:49 (UKJV) As Babylon has caused the slain of Israel to fall, so at Babylon shall fall the slain of all the earth.

47Nʼihi na oge ahụ aghaghị ịbịa mgbe m ga-ata arụsị niile dị na Babilọn ahụhụ. A ga-eme ka ihere mee ala ahụ niile. Ndị ya niile e gburu egbu ga-ada, tọgbọrọkwa nʼime ya,

48mgbe ahụ, eluigwe na ụwa, na ihe niile dị nʼime ha ga-eti mkpu ọṅụ nʼihi ihe dakwasịrị Babilọn. Ndị ga-ebuso ya agha ga-esitekwa nʼugwu bịa.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

49“Babilọn ga-ada nʼihi ndị Izrel e gburu, dịka ndị niile e gburu nʼụwa si daa site nʼaka ndị Babilọn.

50Unu ndị siterela nʼihu mma agha gbapụ ọsọ, wezuganụ onwe unu, unu eguzokwala. Chetanụ Onyenwe anyị nʼala ahụ dị anya, na-echetakwa Jerusalem.”

51“Ihere emeela anyị, nʼihi na a kparịala anyị. Ihere ekpuchiekwala ihu anyị, nʼihi na ndị mba ọzọ abatala nʼebe nsọ nke ụlọnsọ Onyenwe anyị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.