Jeremaya 51

Nʼihi na oge ahụ aghaghị ịbịa mgbe m ga-ata arụsị niile dị na Babilọn ahụhụ. A ga-eme ka ihere mee ala ahụ niile. Ndị ya niile e gburu egbu ga-ada, tọgbọrọkwa nʼime ya,

Jeremiah 51:47 (UKJV) Therefore, behold, the days come, that I will do judgment upon the graven images of Babylon: and her whole land shall be confounded, and all her slain shall fall in the midst of her.

45“Sinụ nʼime ya pụta, unu ndị m! Gbapụnụ ọsọ nʼihi ndụ unu. Gbapụnụ ọsọ site nʼiwe dị ọkụ nke Onyenwe anyị.

46Unu adala mba, unu atụkwala ụjọ, mgbe unu nụrụ akụkọ dị iche iche nʼala ahụ. Nʼihi na otu ụdị akụkọ ka a ga-anụ nʼafọ a, akụkọ ọzọ dị iche ka a ga-anụkwa nʼafọ nke ọzọ. A ga-anụ akụkọ iwusi ọbara nʼala ahụ, nụkwa akụkọ onye ọchịchị nke na-ebuso onye ọchịchị ọzọ agha.

47Nʼihi na oge ahụ aghaghị ịbịa mgbe m ga-ata arụsị niile dị na Babilọn ahụhụ. A ga-eme ka ihere mee ala ahụ niile. Ndị ya niile e gburu egbu ga-ada, tọgbọrọkwa nʼime ya,

48mgbe ahụ, eluigwe na ụwa, na ihe niile dị nʼime ha ga-eti mkpu ọṅụ nʼihi ihe dakwasịrị Babilọn. Ndị ga-ebuso ya agha ga-esitekwa nʼugwu bịa.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

49“Babilọn ga-ada nʼihi ndị Izrel e gburu, dịka ndị niile e gburu nʼụwa si daa site nʼaka ndị Babilọn.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.