51“Ihere emeela anyị, nʼihi na a kparịala anyị. Ihere ekpuchiekwala ihu anyị, nʼihi na ndị mba ọzọ abatala nʼebe nsọ nke ụlọnsọ Onyenwe anyị.”
52“Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-ata arụsị ya niile ahụhụ. Ndị e merụrụ ahụ ga-asụkwa ude nʼala ahụ niile.
53A sịkwarị na Babilọn a arịgoruo nʼeluigwe, ma a sịkwa na o wusie ebe dị elu nke ike ya mee ka o siwanyekwuo ike karịa, aga m ezite ndị mbibi ga-abịa megide ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
54“Ụzụ ịkwa akwa si na Babilọn na-apụta, ụzụ oke ịla nʼiyi sikwa nʼala ndị Babilọn na-apụta.
55Onyenwe anyị ga-ala Babilọn nʼiyi. Ọ ga-emekwa ka oke ụzụ ha kwụsị. Mbigbọ nke ndị iro ga-adịkwa ka mbigbọ nke ọtụtụ mmiri, mkpọtụ nke olu ha ga-ada ụda dị ukwuu.