53A sịkwarị na Babilọn a arịgoruo nʼeluigwe, ma a sịkwa na o wusie ebe dị elu nke ike ya mee ka o siwanyekwuo ike karịa, aga m ezite ndị mbibi ga-abịa megide ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
54“Ụzụ ịkwa akwa si na Babilọn na-apụta, ụzụ oke ịla nʼiyi sikwa nʼala ndị Babilọn na-apụta.
55Onyenwe anyị ga-ala Babilọn nʼiyi. Ọ ga-emekwa ka oke ụzụ ha kwụsị. Mbigbọ nke ndị iro ga-adịkwa ka mbigbọ nke ọtụtụ mmiri, mkpọtụ nke olu ha ga-ada ụda dị ukwuu.
56Onye mbibi ga-ebuso Babilọn agha. A ga-adọta ndị bụ dike ya nʼagha, gbajisiekwa ụta ha niile. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke onye na-akwụghachi; ọ ga-akwụghachikwa nʼuju ya.
57Aga m eme ka ndịisi ọchịchị ya niile, na ndị maara ihe ha ṅụbiga mmanya oke; aga m emekwa ndị ha na-achị achị, na ndịisi ha, na ndị ha bụ dike nʼagha otu ihe ahụ. Ha ga-arahụ ụra ruo mgbe ebighị ebi. Ha agaghị esitekwa nʼụra ahụ bilie ọzọ.” Ọ bụ ihe Eze ahụ kwubiri, bụ onye ahụ aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.