54“Ụzụ ịkwa akwa si na Babilọn na-apụta, ụzụ oke ịla nʼiyi sikwa nʼala ndị Babilọn na-apụta.
55Onyenwe anyị ga-ala Babilọn nʼiyi. Ọ ga-emekwa ka oke ụzụ ha kwụsị. Mbigbọ nke ndị iro ga-adịkwa ka mbigbọ nke ọtụtụ mmiri, mkpọtụ nke olu ha ga-ada ụda dị ukwuu.
56Onye mbibi ga-ebuso Babilọn agha. A ga-adọta ndị bụ dike ya nʼagha, gbajisiekwa ụta ha niile. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke onye na-akwụghachi; ọ ga-akwụghachikwa nʼuju ya.
57Aga m eme ka ndịisi ọchịchị ya niile, na ndị maara ihe ha ṅụbiga mmanya oke; aga m emekwa ndị ha na-achị achị, na ndịisi ha, na ndị ha bụ dike nʼagha otu ihe ahụ. Ha ga-arahụ ụra ruo mgbe ebighị ebi. Ha agaghị esitekwa nʼụra ahụ bilie ọzọ.” Ọ bụ ihe Eze ahụ kwubiri, bụ onye ahụ aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
58Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “A ga-akwada mgbidi Babilọn nke sara mbara, mee ka ọ daruo ala, a ga-eji ọkụ sunye nʼọnụ ụzọ ama ya niile dị elu. Ndị dị iche iche na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu. Ndọgbu nʼọrụ nke mba niile dị iche iche ga-abụ nkụ a na-akwanye nʼọkụ.”