Jeremaya 6

Aga m ebibi ada Zayọn, onye mara ezi mma, na onye dịkwa pekepeke.

Jeremiah 6:2 (UKJV) I have likened the daughter of Zion to a comely and delicate woman.

1“Gbalaganụ unu ụmụ Benjamin! Sitenụ na Jerusalem gbapụ! Gbuonụ opi ike na Tekoa! Bulienụ ihe ngosi elu na Bet-Hakerem! Nʼihi na lee, ihe ọjọọ si nʼakụkụ ugwu na-abịa, e, mbibi dị ukwuu na-abịa.

2Aga m ebibi ada Zayọn, onye mara ezi mma, na onye dịkwa pekepeke.

3Ndị na-azụ atụrụ ga-eduru igwe atụrụ bịa megide ya. Ha ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ya. Onye ọbụla nʼime ha ga-elekọtazi akụkụ ala nke o ketara anya nke ọma.

4“Jikerenụ ibu agha megide ya! Bilienụ, ka anyị buso ha agha nʼehihie. Ma lee, anyanwụ ebidola ịda, onyinyo anyasị na-esetipụkwa onwe ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.