24Anyị anụla akụkọ banyere ude ha, ike agwụla aka anyị abụọ kpamkpam. Oke ihe mgbu na-ejide anyị dị ka nke nwanyị ime na-eme.
25Ka onye ọbụla gharakwa ịga nʼubi, maọbụ ijegharị nʼokporoụzọ, nʼihi na ndị iro ji mma agha na-agagharị, egwu dịkwa nʼebe niile.
26Unu ndị m, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe. Tụrụọnụ onwe unu na ntụ, ruonụ uju, ma kwaanụ akwa, dịka nwanyị na-eru ụjụ nʼihi ọnwụ otu nwa nwoke ọ mụtara. Nʼihi na onye mbibi ahụ ga-abịakwasị anyị na mberede.
27“Emeela m gị ka ị bụrụ onye na-anwapụta ọla, ma ọla ahụ bụkwa ndị m. Achọrọ m ka i nyochaa ma nwapụtakwa ụzọ ha niile.
28Ha bụ ndị nnupu isi, ndị nwere obi nʼazụ, ndị na-ejegharị na-ekwutọ ibe ha. Ha bụ bronz na igwe; ọ bụkwa ndụ rụrụ arụ ka ha na-ebi.