Jeremaya 6

“Emeela m gị ka ị bụrụ onye na-anwapụta ọla, ma ọla ahụ bụkwa ndị m. Achọrọ m ka i nyochaa ma nwapụtakwa ụzọ ha niile.

Jeremiah 6:27 (UKJV) I have set you for a tower and a fortress among my people, that you may know and try their way.

25Ka onye ọbụla gharakwa ịga nʼubi, maọbụ ijegharị nʼokporoụzọ, nʼihi na ndị iro ji mma agha na-agagharị, egwu dịkwa nʼebe niile.

26Unu ndị m, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe. Tụrụọnụ onwe unu na ntụ, ruonụ uju, ma kwaanụ akwa, dịka nwanyị na-eru ụjụ nʼihi ọnwụ otu nwa nwoke ọ mụtara. Nʼihi na onye mbibi ahụ ga-abịakwasị anyị na mberede.

27“Emeela m gị ka ị bụrụ onye na-anwapụta ọla, ma ọla ahụ bụkwa ndị m. Achọrọ m ka i nyochaa ma nwapụtakwa ụzọ ha niile.

28Ha bụ ndị nnupu isi, ndị nwere obi nʼazụ, ndị na-ejegharị na-ekwutọ ibe ha. Ha bụ bronz na igwe; ọ bụkwa ndụ rụrụ arụ ka ha na-ebi.

29Ngwa ọrụ ọkpụ uzu na-afụnwu ọkụ ike ike, ime ka ọkụ rechapụ akụkụ igwe ahụ na-enweghị isi, ma nnụcha ahụ na-aga nʼihu abaghị uru, nʼihi na anụchapụghị ndị ajọ omume.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.