23Ha ji ụta na ùbe, ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-adịghị eme obi ebere. Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri, dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha. Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha, ibuso gị agha, Ada Zayọn.”
24Anyị anụla akụkọ banyere ude ha, ike agwụla aka anyị abụọ kpamkpam. Oke ihe mgbu na-ejide anyị dị ka nke nwanyị ime na-eme.
25Ka onye ọbụla gharakwa ịga nʼubi, maọbụ ijegharị nʼokporoụzọ, nʼihi na ndị iro ji mma agha na-agagharị, egwu dịkwa nʼebe niile.
26Unu ndị m, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe. Tụrụọnụ onwe unu na ntụ, ruonụ uju, ma kwaanụ akwa, dịka nwanyị na-eru ụjụ nʼihi ọnwụ otu nwa nwoke ọ mụtara. Nʼihi na onye mbibi ahụ ga-abịakwasị anyị na mberede.
27“Emeela m gị ka ị bụrụ onye na-anwapụta ọla, ma ọla ahụ bụkwa ndị m. Achọrọ m ka i nyochaa ma nwapụtakwa ụzọ ha niile.