21Ya mere, ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, “Aga m etinye ihe ịsọ ngọngọ nʼụzọ ndị a si agafe. Nna na nwa ya ga-asọ ngọngọ nʼelu ya; otu a kwa, ndị agbataobi na enyi ha ga-ala nʼiyi.”
22Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee, ndị agha si nʼala dị nʼebe ugwu na-abịa; mba dị ukwuu ka a na-akpọlitekwa site na nsọtụ niile nke ụwa.
23Ha ji ụta na ùbe, ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-adịghị eme obi ebere. Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri, dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha. Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha, ibuso gị agha, Ada Zayọn.”
24Anyị anụla akụkọ banyere ude ha, ike agwụla aka anyị abụọ kpamkpam. Oke ihe mgbu na-ejide anyị dị ka nke nwanyị ime na-eme.
25Ka onye ọbụla gharakwa ịga nʼubi, maọbụ ijegharị nʼokporoụzọ, nʼihi na ndị iro ji mma agha na-agagharị, egwu dịkwa nʼebe niile.