Jeremaya 7

Ha ewuolara onwe ha ebe ịchụ aja dị elu na Tofet, nke dị na Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Ebe ahụ ka ha na-anọ na-esure ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom ọkụ. Ihe dị otu a abụkwaghị ụdị ihe m nyere ha nʼiwu ka ha mee. O nwekwaghị oge ihe dị otu a batara m nʼobi.

Jeremiah 7:31 (UKJV) And they have built the high places of Tophet, which is in the valley of the son of Hinnom, to burn their sons and their daughters in the fire; which I commanded them not, neither came it into my heart.

29“ ‘Kpụchaanụ agịrị isi unu, tufuo ya, nọọnụ nʼebe dị elu nke tọgbọrọ nʼefu bulie abụ akwa, nʼihi na Onyenwe anyị esitela nʼoke ọnụma ya jụ ọgbọ a. Ọ gbakụtala ha azụ bụ ọgbọ nke a iwe ya na-adakwasị.

30“ ‘Onyenwe anyị kwupụtara sị, ndị Juda emeela ihe ọjọọ dị iche iche nʼihu m. Ha akpụọla arụsị rụrụ arụ nke ha tinyere nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ha emerụọla ya.

31Ha ewuolara onwe ha ebe ịchụ aja dị elu na Tofet, nke dị na Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Ebe ahụ ka ha na-anọ na-esure ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom ọkụ. Ihe dị otu a abụkwaghị ụdị ihe m nyere ha nʼiwu ka ha mee. O nwekwaghị oge ihe dị otu a batara m nʼobi.

32Ya mere, kpacharanụ anya, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, ụbọchị ndị ahụ na-abịa, mgbe ndị mmadụ na-agaghị akpọkwa ebe ahụ Tofet maọbụ Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Kama ha ga-akpọ ya ndagwurugwu ogbugbu mmadụ, nʼihi na ha ga-eli ọtụtụ ndị ha na Tofet ruo mgbe ha na-agaghị ahụkwa ebe ha ga-eli ndị fọdụrụ.

33Mgbe ahụ, ozu ndị mmadụ ndị a ga-aghọrọ ụmụ anụ ufe na anụ ọhịa ihe oriri. O nwekwaghị onye ga-anọ menye ha egwu chụpụ ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.