Jeremaya 7

Unu atụkwasịla uche unu nʼokwu aghụghọ niile a na-agwa unu na-asị, “Nke a bụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị!”

Jeremiah 7:4 (UKJV) Trust all of you not in lying words, saying, The temple of the LORD, The temple of the LORD, The temple of the LORD, are these.

2“Guzo nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọ Onyenwe anyị kwusaa ozi a nʼebe ahụ, “ ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị Juda niile, ndị na-esi nʼọnụ ụzọ a niile na-abata ife Onyenwe anyị ofufe.

3Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel na-ekwu. Mezienụ ụzọ unu na omume unu niile, m ga-ekwe ka unu biri nʼebe a.

4Unu atụkwasịla uche unu nʼokwu aghụghọ niile a na-agwa unu na-asị, “Nke a bụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị!”

5Ọ bụrụ na unu emee ka ụzọ unu na omume unu guzozie, ọ bụrụ na unu emesoo ibe unu mmeso nʼụzọ ikpe ziri ezi,

6ọ bụrụ na unu ahapụ imegbu ndị ọbịa, na ndị na-enweghị nna, maọbụ nwanyị di ya nwụrụ; ọ bụrụ na unu ajụ iwufu ọbara onye aka ya dị ọcha nʼebe a, ọ bụrụkwa na unu ajụ ịgbaso chi ndị ọzọ nke na-ewetara unu nsogbu,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.