18Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na m hụrụ onye ga-akasị m obi nʼime ọnọdụ iru ụjụ m, nʼihi na obi m na-ada mba nʼime m.
19Gee ntị nụrụ akwa ndị m ka ọ na-ada site nʼebe dị anya. “Onyenwe anyị, ọ sitela na Zayọn pụọ? Ọ pụtara na Eze ha anọkwaghị nʼebe ahụ?” “Gịnị mere ha ji site nʼoyiyi a tụrụ atụ, na arụsị ndị mba ọzọ ha na-efe kpasuo m iwe?”
20“Oge owuwe ihe ubi agafeela, leekwa na ọkọchị agabigakwala, ma a zọpụtabeghị anyị.”
21Ebe ọ bụ na a zọpịara ndị m, ọ bụkwa m ka azọpịara. Anam eru ụjụ, oke egwu jisikwara m aka ike.
22Ọ pụtara na o nweghị mmanụ otite na-eme ka ọnya laa dị na Gilead? Ọ bụ na e nwekwaghị dibịa nọ nʼebe ahụ? Gịnị mere o nweghị ọgwụgwọ dịrị ndị m nʼihi mmerụ ahụ ha niile?