Jeremaya 8

Gee ntị nụrụ akwa ndị m ka ọ na-ada site nʼebe dị anya. “Onyenwe anyị, ọ sitela na Zayọn pụọ? Ọ pụtara na Eze ha anọkwaghị nʼebe ahụ?” “Gịnị mere ha ji site nʼoyiyi a tụrụ atụ, na arụsị ndị mba ọzọ ha na-efe kpasuo m iwe?”

Jeremiah 8:19 (UKJV) Behold the voice of the cry of the daughter of my people because of them that dwell in a far country: Is not the LORD in Zion? is not her king in her? Why have they provoked me to anger with their graven images, and with strange vanities?

17“Lee, ana m ezibata agwọ ọjọọ, ndị na-atagbu atagbu, nʼetiti unu. Ajụala nke ọ dịkwaghị ụra ga-arata ha. Ana m ezibata ha ka ha taa unu.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

18Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na m hụrụ onye ga-akasị m obi nʼime ọnọdụ iru ụjụ m, nʼihi na obi m na-ada mba nʼime m.

19Gee ntị nụrụ akwa ndị m ka ọ na-ada site nʼebe dị anya. “Onyenwe anyị, ọ sitela na Zayọn pụọ? Ọ pụtara na Eze ha anọkwaghị nʼebe ahụ?” “Gịnị mere ha ji site nʼoyiyi a tụrụ atụ, na arụsị ndị mba ọzọ ha na-efe kpasuo m iwe?”

20“Oge owuwe ihe ubi agafeela, leekwa na ọkọchị agabigakwala, ma a zọpụtabeghị anyị.”

21Ebe ọ bụ na a zọpịara ndị m, ọ bụkwa m ka azọpịara. Anam eru ụjụ, oke egwu jisikwara m aka ike.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.