1Ọ gaara adị m mma ma a sị na isi m bụ isi iyi, ebe mmiri si asọpụta; ọ gaara adị m mma ma a sịkwa na anya mmiri akwa jupụtara m nʼanya. Agaara m akwagide akwa ehihie na abalị nʼihi ndị m niile e gburu egbu.
2Ọ gaara adị m mma ma a sị na m nwere ụlọ ndị ije e wuru nʼime ọzara. Ka m nwee ike hapụ ndị m site nʼebe ha nọ pụọ. Nʼihi na ha niile bụ ndị na-akwa iko, igwe ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi.
3“Ha na-ekwe ire ha dịka ụta, ịgbapụ okwu ụgha dịka àkụ; Ọ bụghị site nʼeziokwu ka ihe ji agara ha nke ọma nʼala ahụ. Ha na-esite nʼotu mmehie gaa nʼọzọ; ọ dịkwaghị mgbe ha ji mara m,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
4“Lezie anya, gbaara enyi gị ọsọ. Atụkwasịkwala nwanne gị obi. Nʼihi na nwanne ọbụla na-aghọ aghụghọ. Ndị enyi niile bụkwa ndị nkwutọ.