Job 1

O nwere puku atụrụ asaa, na puku ịnyịnya kamel atọ, na ehi ọnụọgụgụ ha dị otu puku e jikọrọ abụọ abụọ, na narị ịnyịnya ibu ise, na ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi. Ọ bụ nwoke dị ukwuu karịa ndị niile bi nʼọwụwa anyanwụ.

Job 1:3 (UKJV) His substance also was seven thousand sheep, and three thousand camels, and five hundred yoke of oxen, and five hundred she asses, and a very great household; so that this man was the greatest of all the men of the east.

1Otu nwoke aha ya bụ Job bi nʼobodo Uz. Nwoke a bụ Job bụ onye na-enweghị ịta ụta ọbụla, bụrụkwa onye ezi omume nke na-atụ egwu Chineke ma na-agbara mmehie ọsọ.

2Ọ mụrụ ụmụ ndị ikom asaa na ụmụ agbọghọ atọ.

3O nwere puku atụrụ asaa, na puku ịnyịnya kamel atọ, na ehi ọnụọgụgụ ha dị otu puku e jikọrọ abụọ abụọ, na narị ịnyịnya ibu ise, na ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi. Ọ bụ nwoke dị ukwuu karịa ndị niile bi nʼọwụwa anyanwụ.

4Ụmụ ya ndị ikom na-eme mmemme oriri na ọṅụṅụ nʼụbọchị ọmụmụ ha nʼụlọ ha, nke ọbụla nʼime ya nʼusoro. Mgbe ha na-eme nke a, ha na-akpọkwa ụmụnne ha ndị nwanyị atọ ka ha bịa soro ha rie ma ṅụkwaa.

5Mgbe oge mmemme ndị ahụ gwụsịrị, Job na-akpọkọta ụmụ ya doo ha nsọ. Nʼisi ụtụtụ ya, ọ na-achụ aja nsure ọkụ nʼihi onye ọbụla nʼetiti ụmụ ya. Echiche ya bụ, “Ma eleghị anya, ụmụ ya emehiela kọchaa Chineke nʼime obi ha.” Nke a bụ ihe Job na-eme mgbe niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.