23Ole ka ha dị bụ mmejọ na mmehie m mere? Gosi m ajọ omume m na mmehie m.
24Gịnị mere i ji gbakụta m azụ? Gịnị mere i ji gụọ m dịka onye iro gị?
25Ị ga-enye ahịhịa ikuku na-ebugharị ntaramahụhụ? Ị ga-achụ ahịhịa kpọrọ nkụ ọsọ?
26Nʼihi na ị na-edetu ihe ndị dị ilu megide m, na-emekwa ka m ghọrọ mkpụrụ mmehie m mere nʼoge okorobịa m.
27Ị na-eji mkpọrọ igwe kegide ụkwụ m abụọ; na-enyochakwa nzọ ụkwụ m niile site nʼitinye akara nʼebe ọbụla ọbụ ụkwụ m zọrọ.