Job 2

Mgbe ndị enyi Job atọ, Elifaz onye Teman, Bildad onye Shua na Zofa onye Neama, nụrụ banyere nsogbu niile dakwasịrị ya, ha biliri ije site nʼụlọ ha, ha zukọtara site na nkwekọrịta ịga nọnyere ya na ịkasị ya obi.

Job 2:11 (UKJV) Now when Job's three friends heard of all this evil that was come upon him, they came every one from his own place; Eliphaz the Temanite, and Bildad the Shuhite, and Zophar the Naamathite: for they had made an appointment together to come to mourn with him and to comfort him.

9Nwunye ya sịrị ya, “Ị ka na-eguzo nʼizuoke gị? Bụọ Chineke ọnụ, nwụọ.”

10Ma ọ zara, “Ị na-ekwu okwu dịka otu nʼime ndị inyom nzuzu. Anyị ga-anata ihe ọma site nʼaka Chineke, hapụ ịnata ihe ọjọọ?” Ma nʼime nsogbu a niile, Job emehieghị site nʼikwu okwu ọjọọ ọbụla.

11Mgbe ndị enyi Job atọ, Elifaz onye Teman, Bildad onye Shua na Zofa onye Neama, nụrụ banyere nsogbu niile dakwasịrị ya, ha biliri ije site nʼụlọ ha, ha zukọtara site na nkwekọrịta ịga nọnyere ya na ịkasị ya obi.

12Mgbe ha hụrụ ya site nʼebe dị anya, ha amataghị ya, ha weliri olu bido iti mkpu akwa, dọkaa uwe ha yi nʼahụ ha, kporo aja kpokwasị onwe ha nʼisi.

13Ha sooro Job nọdụ nʼala ụbọchị asaa, ehihie na abalị. Ọ dịghị onye gwara ya okwu nʼihi na ha hụrụ otu ihe mgbu ya si dị ukwuu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.