Job 2

Nwunye ya sịrị ya, “Ị ka na-eguzo nʼizuoke gị? Bụọ Chineke ọnụ, nwụọ.”

Job 2:9 (UKJV) Then said his wife unto him, Do you still retain yours integrity? curse God, and die.

7Mgbe ahụ, ekwensu sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ. O were ọnya ọjọọ na-egbu mgbu tie Job, site nʼọbọ ụkwụ ya ruo nʼopi isi ya.

8Job tụtụụrụ mpekele ite wara awa, jiri ya na-akọ onwe ya ọkọ nʼahụ, ma dinara nʼebe e kpokọtara ntụ.

9Nwunye ya sịrị ya, “Ị ka na-eguzo nʼizuoke gị? Bụọ Chineke ọnụ, nwụọ.”

10Ma ọ zara, “Ị na-ekwu okwu dịka otu nʼime ndị inyom nzuzu. Anyị ga-anata ihe ọma site nʼaka Chineke, hapụ ịnata ihe ọjọọ?” Ma nʼime nsogbu a niile, Job emehieghị site nʼikwu okwu ọjọọ ọbụla.

11Mgbe ndị enyi Job atọ, Elifaz onye Teman, Bildad onye Shua na Zofa onye Neama, nụrụ banyere nsogbu niile dakwasịrị ya, ha biliri ije site nʼụlọ ha, ha zukọtara site na nkwekọrịta ịga nọnyere ya na ịkasị ya obi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.