6Onyenwe anyị sịrị ekwensu, “Lee, ọ nọ nʼaka gị. Kama ị ghaghị idebe ndụ ya.”
7Mgbe ahụ, ekwensu sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ. O were ọnya ọjọọ na-egbu mgbu tie Job, site nʼọbọ ụkwụ ya ruo nʼopi isi ya.
8Job tụtụụrụ mpekele ite wara awa, jiri ya na-akọ onwe ya ọkọ nʼahụ, ma dinara nʼebe e kpokọtara ntụ.
9Nwunye ya sịrị ya, “Ị ka na-eguzo nʼizuoke gị? Bụọ Chineke ọnụ, nwụọ.”
10Ma ọ zara, “Ị na-ekwu okwu dịka otu nʼime ndị inyom nzuzu. Anyị ga-anata ihe ọma site nʼaka Chineke, hapụ ịnata ihe ọjọọ?” Ma nʼime nsogbu a niile, Job emehieghị site nʼikwu okwu ọjọọ ọbụla.