16Ma ọganihu ha adịghị nʼaka ha ya mere ana m ewezuga onwe m site na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu.
17“Ma ugboro ole ka a na-emenyụ ọkụ oriọna nke ndị na-emebi iwu? Ugboro ole ka nhụju anya na-adakwasị ha, bụ nke Chineke kenyere ha nʼiwe ya?
18Ugboro ole ka ha dịka ahịhịa kpọrọ nkụ nʼihu ikuku, maọbụ dịka igbugbo ọka nke ikuku siri ike na-efesasị?
19A na-asị, ‘Chineke na-akpakọtara ụmụ ha ntaramahụhụ nke njehie ha.’ Ka a kwụghachi ha ya, ka ha nwee ike mata ya.
20Ka anya ha hụ mbibi nke onwe ya, ka ha ṅụọ ọnụma nke Onye pụrụ ime ihe niile dịka mmiri.