28Unu ga-ajụ m ajụjụ sị, ‘Ugbu a, ole ụlọ oke mmadụ ahụ. Ụlọ ikwu ndị ahụ ebe ndị na-emebi iwu biiri?’
29Ọ bụ na unu ajụbeghị ndị njem ajụjụ? Ọ bụ na unu ejighị ihe ha kọrọ mere ihe,
30na a na-echebe ndị ọjọọ pụọ nʼụbọchị nhụju anya, na a na-anapụta ha site nʼụbọchị oke iwe?
31Onye na-atụ ha mmehie ha nʼihu? Onye kwa na-akwụghachi ha ụgwọ ihe ha mere?
32A na-eburu ha gaa nʼili, a na-echekwa ili ha nche.