2“Gee ntị nke ọma nʼokwu m; ka nke a bụrụ nkasiobi ị ga-enye m.
3Nwee ndidi ka m kwuchaa okwu m, mgbe m kwuchara, gaa nʼihu ịkwa m emo.
4“Ọ bụ mmadụ ka m na-ekpesara? Gịnị ka m ga-eji ghara ịbụ onye na-enweghị ndidi?
5Lee m anya ka ahụ maa gị jijiji; were aka gị kpuchie ọnụ gị.
6Mgbe m chere echiche maka nke a, egwu tụrụ m meekwa ka ahụ m maa jijiji.