11Ọ bụkwa ya mere ọchịchịrị ji gbaa gị gburugburu ka ị ghara ịhụ ụzọ, meekwa ka idee mmiri kpuchie gị.
12“Ọ bụ na Chineke anọghị nʼebe dị elu nke eluigwe? Lee ka ịdị elu nke kpakpando dị elu si dị.
13Kama ị na-asị, ‘Gịnị ka Chineke maara? Ọ na-esite nʼoke ọchịchịrị dị otu a ekpe ikpe?
14Oke ọchịchịrị kpuchiri ya, nke mere na ọ naghị ahụ anyị mgbe ọ na-agagharị nʼebe dị elu nke eluigwe.’
15Ị ga-agbaso ụzọ ochie nke ndị na-eme ihe ọjọọ zoro ije na ya?