14Oke ọchịchịrị kpuchiri ya, nke mere na ọ naghị ahụ anyị mgbe ọ na-agagharị nʼebe dị elu nke eluigwe.’
15Ị ga-agbaso ụzọ ochie nke ndị na-eme ihe ọjọọ zoro ije na ya?
16E bupụrụ ha tupu oge ha eruo. Ntọala ndụ ha ka idee mmiri sachapụrụ
17Ha sịrị Chineke, ‘Hapụ anyị aka! Gịnị ka Onye pụrụ ime ihe niile ga-eme anyị?’
18Ma ọ bụ ya ji ihe dị mma dị iche iche mejupụta ụlọ ha, ya mere ana m ewezuga onwe m site na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu.