1Mgbe ahụ, Elifaz onye Teman zara sị:
2“Mmadụ ọ pụrụ ịbara Chineke uru? Ọ bụladị onye nwere uche ọ pụrụ ịbara Chineke uru?
3O nwere ọṅụ ọ ga-enye Onye pụrụ ime ihe niile ma a sị na ị bụ onye ezi omume? Uru gịnị ka ọ ga-enweta ma ọ bụrụ na ụzọ gị niile enweghị ịta ụta?
4“Chineke ọ na-abara gị mba na-ebo gị ebubo nʼihi na ị na-atụ egwu ya?