20‘Nʼezie, e bibiela ndị iro anyị, ọkụ erepịala akụnụba ha.’
21“Doo onwe gị nʼokpuru Chineke ka gị na ya nọọ nʼudo, nʼụzọ dị otu a, ọganihu ga-abịara gị.
22Gee ntị, nabata ndụmọdụ si ya nʼọnụ, doo okwu ya niile nʼobi gị.
23Ọ bụrụ na ịlaghachikwute Onye pụrụ ime ihe niile, ọ ga-eweghachi gị nʼọnọdụ gị; ọ bụrụ na iwezuga ihe mmebi iwu mee ka ọ dị anya site nʼebe ụlọ ikwu gị dị,
24tọgbọ ọkpụrụkpụ ọlaedo gị nʼaja, tụpụkwa ọlaedo nke Ọfịa gị nʼelu nkume dị nʼime ọdọ mmiri nta.