22Gee ntị, nabata ndụmọdụ si ya nʼọnụ, doo okwu ya niile nʼobi gị.
23Ọ bụrụ na ịlaghachikwute Onye pụrụ ime ihe niile, ọ ga-eweghachi gị nʼọnọdụ gị; ọ bụrụ na iwezuga ihe mmebi iwu mee ka ọ dị anya site nʼebe ụlọ ikwu gị dị,
24tọgbọ ọkpụrụkpụ ọlaedo gị nʼaja, tụpụkwa ọlaedo nke Ọfịa gị nʼelu nkume dị nʼime ọdọ mmiri nta.
25Mgbe ahụ, Onye pụrụ ime ihe niile ga-abụrụ gị ọlaedo, bụkwara gị ọlaọcha kachasị mma.
26Nʼezie, mgbe ahụ kwa, ihe nke Onye pụrụ ime ihe niile ga-atọ mkpụrụobi gị ụtọ, ị ga-ewelikwa ihu gị nye Chineke.